Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 15:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Samuel we si Sọl, Mu ka Jehova zitere ite gi manu ka i buru eze ndi-Ya, bú Israel: ma ub͕u a ge nti olu okwu Jehova.

2. Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Elekọtawom ihe Amalek mere Israel, ihe o doro ya n'uzọ, mb͕e o siri n'Ijipt rigota.

3. Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.

4. Sọl we me ka ndi Israel nuru, o we gukọta ha na Telaim, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ ise ndi ji ukwu eje, na orú nnù ndikom Juda na nnù ise.

5. Sọl we biarue obodo Amalek, rue nbì nime ndagwurugwu.

6. Sọl we si ndi-Kinait, Jenu, wezuga onwe-unu, si n'etiti ndi Amalek rida, ka m'we ghara ikpochapu unu na ha: n'ihi na unu onwe-unu mere umu Israel nile ebere, mb͕e ha siri n'Ijipt rigota. Ndi-Kinait we si n'etiti Amalek wezuga onwe-ha.

7. Sọl we tib͕ue Amalek, site na Havila ebe i nābà Shua, nke di n'iru Ijipt.

8. Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha.

9. Ma Sọl na ndi Israel nwere ọmiko n'aru Egag, na n'aru anu kachasi nma nke ìgwè ewu na aturu, na nke ìgwè ehi, na nke umu anu mara abuba, na n'aru umu-aturu, na n'aru ihe nile di nma, ha ekweghi kwa iwezuga ha ka ebibie ha: ma anu-ulo ọ bula nke di nlelì nke ta-kwa-ra aru, nke ahu ka ha wezugara ka ebibie ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 15