Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 14:45-51 Bible Nso (IGBOB)

45. Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.

46. Sọl we si n'iso ndi Filistia rigo: ndi Filistia we la n'ebe nke ha.

47. Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.

48. O we me ihe dìnkpà, tib͕u kwa Amalek, we naputa Israel n'aka ndi nāpunara ha ihe.

49. Ma umu-ndikom Sọl bu Jonatan, na Ishvi, na Malki-shua: aha umu-ya ndinyom abua kwa: aha nke ada-ya bu Mirab, aha nke-ntà bu Maikal:

50. aha nwunye Sọl bu Ahinoam nwa Ahimaaz: aha onye-isi usu-ndi-agha-ya bu Abnea nwa Nea, nwa-nne nna Sọl.

51. Kish bu nna Sọl; Nea nna Abnea bu nwa Abiel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 14