Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 14:32-45 Bible Nso (IGBOB)

32. Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n'agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n'ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara.

33. Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n'iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta.

34. Sọl we si, B͕asanu onwe-unu n'etiti ndi Israel, si ha, Wetaranum nso, nwoke ọ bula ehi-ya, na nwoke ọ bula aturu-ya, b͕u-kwa-nu ha n'ebe a, rie; unu emehie-kwa-la megide Jehova n'iri anu. ya na ọbara. Ndi Israel nile we weta nso, nwoke ọ bula ehi-ya n'aka-ya n'abali ahu, ha we b͕ue ha n'ebe ahu.

35. Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova.

36. Sọl we si, Ka ayi rida sochie ndi Filistia n'azu n'abali, luta ihe-ha n'agha rue ìhè ututu, ka ayi ghara kwa ikwe ka nwoke fọdu n'etiti ha. Ha we si, Me ihe ọ bula nke di nma n'anya-gi. Onye-nchu-àjà we si, Ka ayi biarue Chineke nso n'ebe a.

37. Sọl we jua Jehova ase, si, M'gārida sochie ndi Filistia n'azu? Ì gēnye ha n'aka Israel? Ma Ọ zaghi ya n'ubọchi ahu.

38. Sọl we si, Biaruenu nso n'ebe a, unu ndi-isi nile nke ndi Israel: mara-kwa-nu hu ihe nke nmehie a diworo nime ya ta.

39. N'ihi na Jehova nādi ndu, Onye nāzọputa Israel; n'ezie ọ buru na ọ di nime Jonatan nwam, n'ezie ọ ghaghi inwu. Ma ọ dighi onye nāza ya okwu n'etiti ndi Israel nile.

40. O we si Israel nile, Unu onwe-unu nọ n'otù ofè, mu onwem na Jonatan nwam gānọ kwa n'ofè nke-ọzọ. Ndi Israel we si Sọl, Me ihe nke di nma n'anya-gi.

41. Sọl we si Jehova, bú Chineke Israel, Nye nzà zuru okè. Nzà we ma Jonatan na Sọl: ma ndi Israel puru ya.

42. Sọl we si, Fenu nzà n'etiti mu na Jonatan nwam. Nzà we ma Jonatan.

43. Sọl we si Jonatan, Gosim ihe i meworo. Jonatan we gosi ya, si, N'ezie ewerem ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'akam detu nwantī manu-aṅu ire; lem, m'gānwu.

44. Sọl we si, Chineke me otú a, me kwa ihe ọzọ otú a: n'ihi na i ghaghi inwu, Jonatan.

45. Ndi Israel we si Sọl, Jonatan, ọ̀ gānwu, bú onye zọputara nzọputa uku a n'Israel? ya buru ihe-árú: Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nke isi-ya gādaru ala; n'ihi na ya na Chineke aluwo ọlu ta. Ndi Israel we b͕aputa Jonatan, o we ghara inwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 14