Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 13:8-23 Bible Nso (IGBOB)

8. O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa.

9. Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu.

10. O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku ahu, le, Samuel biara; Sọl we pua izute ya, ka o we gọzie ya.

11. Samuel we si, Gini ka i meworo? Sọl we si, N'ihi na ahurum na ndi Israel esiwo n'ebe m'nọ b͕asa, ma gi onwe-gi abiaghi n'ubọchi akara àkà, ndi Filistia nāchikọta kwa onwe-ha na Mikmash;

12. m'we si, Ub͕u a ka ndi Filistia gāridakutem rue Gilgal, ma emeghm ka iru Jehova dajua; m'we jisie onwem ike, we sure àjà-nsure-ọku ahu.

13. Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Ma ub͕u a ala-eze-gi agaghi-eguzosi ike: Jehova achọputaworo Onwe-ya otù nwoke dika obi-Ya si chọ, Jehova enyewo kwa ya iwu ibu onye-ndú ndi-Ya, n'ihi na i debeghi ihe ahu nke Jehova nyere gi n'iwu.

15. Samuel we bilie, si na Gilgal rigorue Gibea Benjamin. Sọl we gukota ndi Israel, bú ndi ahutara n'aka-ya, ihe ra ka nnù ndikom na ọgu iri.

16. Sọl, na Jonatan nwa-ya, na ndi ahutara n'aka-ha, we nọdu na Geba Benjamin: ma ndi Filistia mara ulo-ikwū-ha na Mikmash.

17. Ndi-nbibi we si n'ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia puta n'usu atọ: otù usu chere iru n'uzọ Ọfra, rue ala Shual:

18. otù usu we che iru n'uzọ Bet-horon: otù usu we che iru n'uzọ ókè-ala nke nēlekwasi ndagwurugwu Zeboim anya, n'ebe ọzara di.

19. Ma achọtaghi uzú ọ bula n'ala nile nke Israel: n'ihi na ndi Filistia siri, Ka ndi-Hibru we ghara ikpu mma-agha ma-ọbu ube:

20. Israel nile we ridakuru ndi Filistia iti ihe-ọlu-ha ufe, onye ọ bula ígwè-ikpọzè-ala-ya, na mma-ọgè-ya, na anyu-ike-ya, na ọ́gù-ya;

21. (ọnu ọ́gù na nke nma-ọgè na nke ndudu-ilu-ọlu-ubi na nke anyu-ike we ghara idi nkọ); na ikpu ọnu ndudu eji achu ehi.

22. O rue, n'ubọchi agha, na ahutaghi mma-agha ma-ọbu ube n'aka onye ọ bula n'etiti ndi soro Sọl na ndi soro Jonatan: ma ahutara n'aka Sọl na n'aka Jonatan nwa-ya.

23. Ndi ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia we pua rue ngabiga Mikmash.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 13