Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 13:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal.

5. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.

6. Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù.

7. Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n'azu.

8. O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa.

9. Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu.

10. O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku ahu, le, Samuel biara; Sọl we pua izute ya, ka o we gọzie ya.

11. Samuel we si, Gini ka i meworo? Sọl we si, N'ihi na ahurum na ndi Israel esiwo n'ebe m'nọ b͕asa, ma gi onwe-gi abiaghi n'ubọchi akara àkà, ndi Filistia nāchikọta kwa onwe-ha na Mikmash;

12. m'we si, Ub͕u a ka ndi Filistia gāridakutem rue Gilgal, ma emeghm ka iru Jehova dajua; m'we jisie onwem ike, we sure àjà-nsure-ọku ahu.

13. Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 13