Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 13:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Sọl b͕ara arọ mb͕e ọ malitere ibu eze; ọ we buru eze Israel arọ abua.

2. Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.

3. Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.

4. Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal.

5. Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.

6. Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù.

7. Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n'azu.

8. O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa.

9. Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 13