Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 12:10-24 Bible Nso (IGBOB)

10. Ha we tikue Jehova nkpu, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi arapuwo Jehova, we fè Bealim na Ashtarot òfùfè: ma ub͕u a naputa ayi n'aka ndi-iro-ayi, ayi gēfè kwa Gi òfùfè.

11. Jehova we zite Jerubeal, na Bedan, na Jefta, na Samuel, we naputa unu n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi.

12. Unu we hu na Nehash, bú eze umu Amom, biara imegide unu, unu we sim, É-è, kama otù eze gāburu ayi eze: ma Jehova, bú Chineke-unu, bu eze-unu.

13. Ma ub͕u a le eze nke unu rọputaworo, onye unu riọrọm n'aka: ma, le, Jehova emewo ka eze nāchi unu.

14. Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n'okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma:

15. ma ọ buru na unu egeghi nti olu Jehova, kama unu nānupu isi n'okwu-ọnu Jehova, aka Jehova gādi kwa imegide unu, otú ọ di imegide nna-unu-hà.

16. Ub͕u a kwa guzonu onwe-unu, hu ihe uku a, nke Jehova nēme n'anya-unu.

17. Ọ̀ bughi obìbì ọka wheat ta? M'gākpọku Jehova, Ọ gēnye kwa éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo; mara-kwa-nu hu kwa na ihe ọjọ unu riri nne, nke unu meworo n'anya Jehova, n'iriọrọ onwe-unu eze.

18. Samuel we kpọkue Jehova; Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na miri-ozuzo ubọchi ahu: ndi Israel nile we tua egwu Jehova na Samuel nke-uku.

19. Ndi Israel nile we si Samuel, Kpere Jehova, bú Chineke-gi, ekpere bayere ndi-orù-gi, ka ayi ghara inwu: n'ihi na ayi atukwasiwo ihe ọjọ a na nmehie-ayi nile, n'iriọrọ onwe-ayi eze.

20. Samuel we si ndi Israel, Unu atula egwu: unu onwe-unu emewo ihe ọjọ a nile; nání unu ewezugala onwe-unu n'iso Jehova, kama werenu obi-unu nile fè Jehova òfùfè;

21. unu ewezuga-kwa-la onwe-unu: n'ihi na mb͕e ahu ka unu ganēso n'azu ihe tọb͕ọrọ n'efu, nke nādighi-abà urù, nke nādighi-anaputa kwa, n'ihi na ihe tọb͕ọrọ n'efu ka ha bu.

22. N'ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n'ihi aha uku Ya: n'ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi.

23. Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi.

24. Nání tuanu egwu Jehova, were obi-unu nile fè Ya òfùfè n'ezi-okwu: n'ihi na, lenu ihe uku O meworo n'ebe unu nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 12