Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 10:4-19 Bible Nso (IGBOB)

4. ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n'aka-ha.

5. Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:

6. Mọ nke Jehova gādakwasi gi n'ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ.

7. O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n'ihi na Chineke nọyere gi.

8. I gēbukwam uzọ rida rue Gilgal; ma, le, mu onwem nāridakute gi, isure àjà-nsure-ọku, na ichu ihe àjà nke àjà-udo: ubọchi asa ka i ganēche, rue mb͕e m'gābiakute gi, me ka i mara ihe i gēme.

9. O rue, mb͕e o chighariri azu-ya isi n'ebe Samuel nọ la, na Chineke b͕anwere ya obi ọzọ: ihe-iriba-ama ndia nile we rè n'ubọchi ahu.

10. Ha we biarue ebe ahu, rue ugwu ntà ahu, ma, le, usu ndi-amuma zutere ya; Mọ nke Chineke we dakwasi ya n'ike, o we bū amuma n'etiti ha.

11. O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

12. Otù nwoke nke sitere n'ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N'ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

13. O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu.

14. Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.

15. Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.

16. Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.

17. Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;

18. o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n'Ijipt rigota, M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt na n'aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu:

19. ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 10