Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 10:20-27 Bible Nso (IGBOB)

20. Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin.

21. O we me ka ebo Benjamin biarue nso n'ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.

22. Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n'etiti ihe.

23. Ha we b͕a ọsọ, si n'ebe ahu kuru ya; o we guzo onwe-ya n'etiti ndi Israel, ma ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel site n'ubu-ya we rue elu isi-ya.

24. Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n'etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.

25. Samuel we gwa ndi Israel ikpe ala-eze ahu, de kwa ya n'akwukwọ, dọba ya n'iru Jehova. Samuel we zilaga ndi Israel nile, nwoke ọ bula n'ulo-ya.

26. Sọl we la kwa n'ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya.

27. Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 10