Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 10:11-26 Bible Nso (IGBOB)

11. O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

12. Otù nwoke nke sitere n'ebe ahu we za, si, Ònye bu kwa nna-ha? N'ihi ya ọ ghọrọ ilu, bú okwu a, Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?

13. O we bubìe amuma, bia rue ebe di elu ahu.

14. Nwa-nne nna Sọl we si ya na nwa-okorọbia-ya, Òle ebe unu jere? Ọ si, Ichọ nne-inyinya-ibu-ayi: ayi we hu na ọ dighi ebe ọ bula ha di, ayi we biakute Samuel.

15. Nwa-nne nna Sọl we si, Biko, gosim ihe Samuel siri unu.

16. Sọl we si nwa-nne nna-ya, O gosiri ayi nke-ọma na achọtawo nne-inyinya-ibu. Ma o gosighi ya okwu ala-eze ahu nke Samuel kwuru.

17. Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;

18. o we si umu Israel, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka Israel si n'Ijipt rigota, M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt na n'aka ala-eze nile nke nēmeb͕u unu:

19. ma unu onwe-unu ajuwo Chineke-unu ta, Onye Ya onwe-ya nāzọputa unu n'aka ihe ọjọ unu nile na nkpab͕u nile unu; unu we si Ya, É-è, kama mere ayi eze. Ma ub͕u a guzonu onwe-unu n'iru Jehova n'ebo nile unu, na n'usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri unu.

20. Samuel we me ka ebo Israel nile biarue nso, nzà we ma ebo Benjamin.

21. O we me ka ebo Benjamin biarue nso n'ab͕uru nile ha, nzà we ma ab͕uru Matri: nzà we ma Sọl nwa Kish: ha we chọ ya, ma achọtaghi ya.

22. Ha we ju kwa Jehova ase ọzọ, si, Ọ̀ kābiaghi ebe a, bú nwoke ahu? Jehova we si, Le, onye ahu ezowo onwe-ya n'etiti ihe.

23. Ha we b͕a ọsọ, si n'ebe ahu kuru ya; o we guzo onwe-ya n'etiti ndi Israel, ma ọ di ogologo kari onye ọ bula nime ndi Israel site n'ubu-ya we rue elu isi-ya.

24. Samuel we si ndi Israel nile, Ùnu ahuwo onye ahu nke Jehova rọputaworo, na ọ dighi onye di ka ya n'etiti ndi Israel nile? Ndi Israel nile we tie nkpu, si, Ka eze-ayi di ndu.

25. Samuel we gwa ndi Israel ikpe ala-eze ahu, de kwa ya n'akwukwọ, dọba ya n'iru Jehova. Samuel we zilaga ndi Israel nile, nwoke ọ bula n'ulo-ya.

26. Sọl we la kwa n'ulo-ya rue Gibea; ndi bu dìnkpà, ndi Chineke meturu obi-ha aka, we jeso ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 10