Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Samuel 10:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. Samuel we were karama manu, wukwasi ya n'isi-ya, sutu ya ọnu, si, Ọ̀ bughi na Jehova etewo gi manu ibu onye-ndú ihe-nketa-Ya?

2. Mb͕e i siri n'ebe m'nọ la ta, i gāhuta kwa ndikom abua n'akuku ílì Rechel n'ókè-ala Benjamin na Zelza; ha gāsi kwa gi, Achọtawo nne-inyinya-ibu nke i jere ichọ: ma, le, nna-gi arapuwo okwu nne-inyinya-ibu-ya, ọ nēcheb͕u kwa onwe-ya bayere unu, si, Gini ka m'gēme ichọta nwam?

3. I gēsi kwa n'ebe ahu gabiga n'iru, bia rue osisi terebinth nke Teboa, ma ndikom atọ ndi nārigokuru Chineke rue Bet-el gāhuta gi n'ebe ahu, otù onye nēbu umu-ewu atọ, otù onye nēbu ob͕e achicha atọ, otù onye nēbu kwa karama-akpukpọ manya-vine:

4. ha gāju kwa gi ajuju bayere udo-gi, we nye gi ob͕e achicha abua; i gānara kwa ha n'aka-ha.

5. Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:

6. Mọ nke Jehova gādakwasi gi n'ike, i gēsoro kwa ha bū amuma, i gāb͕anwe kwa ghọ nwoke ọzọ.

7. O gēru kwa, mb͕e ihe-iriba-ama ndia biaruru gi aru, gi mere onwe-gi dika aka-gi si chọta; n'ihi na Chineke nọyere gi.

8. I gēbukwam uzọ rida rue Gilgal; ma, le, mu onwem nāridakute gi, isure àjà-nsure-ọku, na ichu ihe àjà nke àjà-udo: ubọchi asa ka i ganēche, rue mb͕e m'gābiakute gi, me ka i mara ihe i gēme.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Samuel 10