Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 8:62-66 Bible Nso (IGBOB)

62. Eze, ya na Israel nile, nāchu kwa àjà n'iru Jehova.

63. Solomon we chua ihe àjà nke àjà-udo nke ọ churu nye Jehova, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na umu Israel nile we ra ulo Jehova nye Chineke.

64. N'ubọchi ahu ka eze doro etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke di n'iru Jehova di ntà kari inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba àjà-udo.

65. Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ.

66. N'ubọchi nke-asatọ o zilagara ndi Israel, ha we gọzie eze, la n'ulo-ikwū-ha nāṅuri ọṅu, obi di kwa ha nma, n'ihi ezi ihe nile nke Jehova mere Devid, bú orù-Ya, nke O me-kwa-ra Israel, bú ndi-Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 8