Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 8:55-63 Bible Nso (IGBOB)

55. O we guzo, were oké olu gọzie nkpọkọta nile nke Israel, si,

56. Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya.

57. Ka Jehova, bú Chineke-ayi, nọyere ayi, dika Ọ nọyere nna-ayi-hà: ka Ọ ghara irapu ayi, ka Ọ ghara kwa ib͕anari ayi:

58. ka O we wezuga obi-ayi ka ha biakute Ya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu.

59. Ka okwum ndia, nke m'jiri riọ amara n'iru Jehova, di kwa nso Jehova, bú Chineke-ayi, ehihie na abali, ka O we mezie ikpé orù-Ya, na ikpé ndi-Ya, bú Israel, ihe ubọchi n'ubọchi-ya:

60. ka ndi nile nke uwa we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; onye ọzọ adighi.

61. Ka obi-unu zu kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ayi, nọ, ijeghari n'ukpuru-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, otú ọ di ta.

62. Eze, ya na Israel nile, nāchu kwa àjà n'iru Jehova.

63. Solomon we chua ihe àjà nke àjà-udo nke ọ churu nye Jehova, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na umu Israel nile we ra ulo Jehova nye Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 8