Ha we bugota ib͕e Jehova, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà na ndi Livai we bugota ha.