isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Solomon nọ arọ iri na atọ n'iwu ulo nke aka ya, ọ we wubìe ulo-ya nile.

2. O we wue ulo oké ọhia Lebanon; ọgu cubit ise ka ogologo-ya di, ọgu cubit abua na iri ka obosara-ya di kwa, orú cubit na iri ka idi-elu-ya di, ọ di n'elu akuku anọ nke ogidi osisi cedar, osisi cedar awara awa di kwa n'elu ogidi ahu.

3. Ewere osisi cedar kpuchie ya n'elu, n'elu ọgu ulo ntà nke akuku abua na ise, nke di n'elu ogidi; iri na ise n'otù akuku.

4. Ọnọdu window di kwa n'akuku atọ, ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

5. Ọnu-uzọ nile na awara-uzọ nile nwere akuku anọ ra nrata, n'ọnọdu window: ebe nleputa-anya di kwa na ncherita-iru ebe nleputa-anya n'okpukpu atọ.

6. O me-kwa-ra uzọ-nbata nke ogidi; ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, orú cubit na iri ka obosara-ya di kwa; uzọ-nbata di kwa n'iru ha; ogidi na nbata-uzọ di kwa n'iru ha.

7. Ọ me-kwa-ra uzọ-nbata nke oche-eze ebe ọ ganēkpe ikpe, bú uzọ-nbata ikpé: ewere kwa osisi cedar kpuchie ya site n'ala ulo rue ala ulo.

8. Ma ulo-ya ebe o nēbi, bú ogige ọzọ nke di nime uzọ-nbata, ọ di ka ọlu a si di. O wu-kwa-ra ulo nye nwa-nwayi Fero, (bú nwayi nke Solomon luru na nwunye,) dika uzọ-nbata nka.

9. Eji nkume di oké ọnu-ahia wu ndia nile, bú nkume awara awa, dika ọtùtù si di, nkume eji mma-nkwọ kwọ, n'ime na n'èzí, bú site na ntọ-ala rue ndobi-ya, na n'èzí rue ogige uku ahu.

10. Ntọ-ala-ya bu kwa nkume di oké ọnu-ahia, bú nkume uku, nkume di cubit iri, na nkume di cubit asatọ.

11. Nkume nke di oké ọnu-ahia di kwa n'elu, dika ọtùtù nke osisi awara awa si di, na osisi cedar.

12. Ogige uku nke di buruburu nwe-kwa-ra akuku atọ nke nkume awara awa, na otù ariri nke osisi cedar awara awa; ọbuná dika ogige ime-ime ulo Jehova si enwe, na dika uzọ-nbata ulo si enwe.

13. Eze Solomon we ziga si na Taia kuputa Hairam.

14. Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.

15. O we kpua ogidi ọla abua, cubit iri na asatọ ka idi-elu otù ogidi di: ogho cubit iri na abua b͕a-kwa-ra ogidi nke-abua buruburu.

16. O me-kwa-ra isi abua nke ọla awuru awu, itiye n'elu ogidi: cubit ise ka idi-elu otù isi di, cubit ise ka idi-elu isi nke-ọzọ di kwa.

17. Ihe-ọkpukpa, bú ihe emere ka ha yie ihe-ọkpukpa, na ihe aturu atu, bú ihe emere ka ha yie iyab͕a, diri isi nke di n'elu ogidi abua; asa diri otù isi, asa di-kwa-ra isi nke-ọzọ.

18. O me ogidi abua ahu; akuku abua dikwasi otù ihe-ọkpukpa buruburu, ikpuchi isi nke di n'elu pomegranate: otú a ka o me-kwa-ra isi nke-ọzọ.

19. Isi nke di n'elu ogidi n'uzọ-nbata ahu bu ihe emere ka ha yie urodi, cubit anọ.

20. Ma isi di kwa n'elu ogidi abua ahu n'elu, na ncherita-iru afọ nke di n'akuku ihe-ọkpukpa: pomegranate di ọgu iri, n'akuku nke dikwasi isi nke-ọzọ buruburu.

21. O guzo ogidi abua ahu n'uzọ-nbata nke ulo uku Chineke: o guzo ogidi aka-nri, kpọ aha-ya Jakin: o guzo ogidi aka-ekpe, kpọ aha-ya Boaz.

22. Ma n'elu ogidi ihe di nke emere ka o yie urodi: ewe luzue ọlu ogidi abua ahu.

23. O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.

24. Afufa-ọhia di kwa n'okpuru ọnu-ya buruburu nke nāb͕a ya buruburu, iri di n'otù cubit, nāb͕a oké osimiri ahu buruburu: afufa-ọhia ahu di ariri abua, awuru mb͕e awuru ya.

25. Ọ nēguzo n'elu ehi iri na abua, atọ nēche iru n'Ugwu, atọ nēche iru n'Ọdida-anyanwu, atọ nēche iru na Ndida, atọ nēche iru n'Ọwuwa-anyanwu: oké osimiri ahu we dikwasi ha n'elu, azu-ha nile di kwa nime.

26. Ib͕idi-ya di otù ntù-ọbu-aka; emere ọnu-ya dika anēme ọnu iko, dika okoko urodi: nnù bath ise ka ọ nānagide.

27. Ọ me ihe-ndọkwasi iri nke ọla; cubit anọ ka ogologo otù ihe-ndọkwasi di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.

28. Ma nka bu otú emere ihe-ndọkwasi: ha nwere ihe-njikọ, bú ihe-njikọ n'etiti nkwukọta-ya:

29. ọdum na ehi na cherubim di n'ihe-njikọ nke di n'etiti nkwukọta ahu; ihe-ndọkwasi dikwasi na nkwukọta n'elu: ihe aturu atu nke emere ka o yie ihe-nkwuba di kwa n'okpuru ọdum nile na ehi nile.

30. Ihe-ndọkwasi ọ bula nwere wheel ọla anọ, na axle ọla: ukwu-ya anọ nwere ubu: n'okpuru ite ọsisa-miri ahu ka ubu ahu akpuru akpu di, n'akuku ihe aturu atu ọ bula.

31. Ọnu-ya nime isi-ya na n'elu di otù cubit: ọnu-ya di kwa buruburu, otú emere ihe-ndọkwasi, otù cubit na nkera cubit: ihe-ọpipi dikwasi kwa n'ọnu-ya, ihe-njikọ nile ha nwere akuku anọ ra nrata, ha adighi buruburu.

32. Wheel anọ ahu di n'okpuru ihe-njikọ: aka wheel di n'ihe-ndọkwasi: idi-elu otù wheel di otù cubit na nkera cubit.

33. Otú emere wheel nile di ka esi eme wheel ub͕ọ-ala: aka nile ha, na azu nile ha, na ihe nile nējikọta ha, na etiti nile ha, awuru ha nile awu.

34. Ubu anọ di na nkuku anọ nke ihe-ndọkwasi ọ bula: ubu-ya sitere n'ihe-ndọkwasi ahu.

35. Ihe di gburugburu gburugburu, nke idi-elu-ya di nkera cubit, di n'elu ihe-ndọkwasi ahu: aka-ya nile na ihe-njikọ-ya nile, nke di n'elu ihe-ndọkwasi ahu sitere na ya.

36. O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n'elu mbadamba aka-ya nile, na n'elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu.

37. Otú a ka o mere ihe-ndọkwasi iri ahu: ha nile nwere otù ọwuwu, na otù ọtùtù, na otù ọpipi.

38. O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n'elu ihe-ndọkwasi ọ bula n'ihe-ndọkwasi iri ahu.

39. O tiye ihe-ndọkwasi ahu, ise n'akuku aka-nri ulo ahu, ise n'akuku aka-ekpe ulo ahu: o tiye kwa oké osimiri ahu n'akuku aka-nri ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu, na ncherita iru Ndida.

40. Hairam me-kwa-ra ite ọsisa-miri nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Hairam we jebìe ozi nile nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova:

41. ogidi abua ahu, na ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi abua; na ihe-ọkpukpa abua ahu ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'elu ogidi;

42. na nnù pomegranate ahu nke diri ihe-ọkpukpa abua ahu; bú akuku pomegranate abua bayere otù ihe-ọkpukpa, ikpuchi ọkwa abua nke isi nke di n'iru ogidi;

43. na ihe-ndọkwasi iri ahu, na ite ọsisa-miri iri ahu nke di n'elu ihe-ndọkwasi;

44. na otù oké osimiri ahu, na ehi iri na abua ahu nke di n'okpuru oké osimiri;

45. na ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile: ma ihe ndia nile, nke Hairam mere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova, bu ọla nēb͕u maramara.

46. Na buruburu-ala Jọdan ka eze wuru ha, n'ala urọ n'etiti Sukot na Zaretan.

47. Solomon we dọba ihe ahu nile ghara itù ha, n'ihi na ha bara uba nke ukwu: achọputaghi ọtùtù ọla ahu.

48. Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ya, ọ bu ọla-edo:

49. na ihe-idọba-oriọna, ise n'aka-nri, ise n'aka-ekpe, n'iru ime-ime-ulo ahu, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na okoko-osisi nile, na oriọna nile, na nkpa nile, ha bu ọla-edo;

50. na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo.

51. Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.