Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 22:48-53 Bible Nso (IGBOB)

48. Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n'ihi na etiwara ub͕ọ ahu n'Ezion-geba.

49. Mb͕e ahu Ehazaia nwa Ehab siri Jehoshafat, Ka ndi-orùm soro ndi-orù-gi je n'ub͕ọ-gi. Ma Jehoshafat ekweghi.

50. Jehoshafat we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid nna-ya: Jehoram nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

51. Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua.

52. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je kwa ije n'uzọ nna-ya, na n'uzọ nne-ya, na n'uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie.

53. O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 22