Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 22:34-45 Bible Nso (IGBOB)

34. Ma otù nwoke dọrọ uta-ya nāmaghi onye ọ bu, we b͕ata eze Israel n'etiti njikọ ihe-agha-ya na uwe-agha-ya: o we si onye-ub͕ọ-ala-ya, Chigharia aka-gi, me ka m'si n'ọmuma-ulo-ikwū pua; n'ihi na ọria nāriam.

35. Agha we la elu n'ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n'anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n'etiti ub͕ọ-ala-ya.

36. Iti-nkpu we gazue n'ọmuma-ulo-ikwū mb͕e anyanwu nāda, si, Nwoke ọ bula, ya la n'obodo-ya, nwoke ọ bula, ya la n'ala-ya.

37. Eze we nwua, ewe bubata ya na Sameria; ha we lìe eze na Sameria.

38. Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n'akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n'ebe ahu;) dika okwu Jehova si di nke O kwuru.

39. Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

40. Ehab we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

41. Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n'arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel.

42. Jehoshafat b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise na Jerusalem. Aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi.

43. O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile.

44. Jehoshafat me-kwa-ra ka ya na eze Israel di n'udo.

45. Ma okwu Jehoshafat nile nke fọduru, na ihe idi-ike-ya nke o mere, na otú o buru agha, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 22