Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 22:11-16 Bible Nso (IGBOB)

11. Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.

12. Ndi-amuma nile nēbu kwa amuma otú a, si, Rigorue Remot-gilead, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma: Jehova enyewo kwa ya n'aka eze.

13. Ma onye-ozi ahu nke jere ikpọ Maikaia gwara ya okwu, si, Biko, le, okwu nile nke ndi-amuma, dika otù ọnu, nēkwuru eze ezi ihe: biko, ka okwu-gi di ka okwu otù onye nime ha, gi kwu kwa ezi ihe.

14. Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m'gēkwu.

15. O we biakute eze. Eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu àyi gārapu? Ọ si ya, Rigo, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma; Jehova enyewo kwa ya n'aka eze.

16. Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 22