Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 20:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha.

2. O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya,

3. Otú a ka Ben-hedad siri, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi, nkem ka ọ bu; ndinyom-i kwa na umu-gi, bú nke di nma kari, nkem ka ha bu.

4. Eze Israel we za, si, Dika okwu-gi si di, Onye-nwem, eze; nke gi ka mu onwem na ihe nile m'nwere bu.

5. Ndi-ozi ahu we biaghachi, si, Otú a ka Ben-hedad kwuru, si, N'ezie eziterem i ozi, si, Ọla-ọcha-gi na ọla-edo-gi na ndinyom-i na umu-gi, mu ka i gēnye ha;

6. ma m'gēzitere gi ndi-orùm dika mb͕e a echi, ha gāchọ kwa n'ulo-gi, na ulo ndi-orù-gi;ọ gēru kwa, na ihe ọ bula anya-gi nāchọsi ike, ha gētiye ya n'aka-ha, were ya.

7. Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n'ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n'aka-ya.

8. Ndi-okenye nile na ndi Israel nile we si ya, Anula okwu-ya, ekwe-kwa-la.

9. O we si ndi-ozi Ben-hedad, Sinu onye-nwem, bú eze, Ihe nile i buru uzọ zitere orù-gi ozi ime, nke ahu ka m'gēme: ma ihe a, apughm ime ya. Ndi-ozi we la, weghachiri ya okwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 20