Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 16:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Ọzọ kwa, n'aka Jihu, bú nwa Hanani, onye-amuma, ka okwu Jehova biara imegide Beasha, na imegide ulo-ya, ma n'ihi ihe ọjọ nile nke o mere n'anya Jehova, iwere omume aka-ya kpasue Ya iwe, n'idi ka ulo Jeroboam; ma n'ihi na o tib͕uru ya.

8. N'arọ nke-orú-na-isi nke Esa, bú eze Juda, ka Ila nwa Beasha malitere ibu eze Israel nime Tiaza, arọ abua.

9. Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza:

10. Zimri we ba, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, n'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya.

11. O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-eze-ya, na o tib͕uru ulo Beasha nile: o kweghi ka otù nwa-nwoke fọduru ya, ma ọ bu nime ndi-ikwu-ya, ma-ọbu nime ndi-eyì-ya.

12. Zimri we kpochapu ulo Beasha nile, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru megide Beasha n'aka Jihu, bú onye-amuma,

13. bayere nmehie nile nke Beasha, na nmehie nile nke Ila, bú nwa-ya, nke ha mehiere, na nke ha ji me Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

14. Ma okwu Ila nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

15. N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 16