Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 16:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Zimri we kpochapu ulo Beasha nile, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru megide Beasha n'aka Jihu, bú onye-amuma,

13. bayere nmehie nile nke Beasha, na nmehie nile nke Ila, bú nwa-ya, nke ha mehiere, na nke ha ji me Israel mehie, iwere ihe-efu nile ha kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe.

14. Ma okwu Ila nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

15. N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.

16. Ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū we nu, si, Zimri ekekọtawo madu, ọzọ kwa, o tib͕uwo eze: Israel nile we me Ọmri, bú onye-isi usu-ndi-agha, ka ọ buru eze Israel n'ubọchi ahu n'ọmuma-ulo-ikwū.

17. Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n'agha.

18. O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua,

19. n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.

20. Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 16