Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 14:19-31 Bible Nso (IGBOB)

19. Ma ihe nile nke fọduru nke Jeroboam mere, ka o si bu agha, na ka o si buru eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.

20. Ubọchi nke Jeroboam buru eze we di orú arọ na abua: o we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, Nedab, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

21. Ma Rehoboam, bú nwa Solomon, bu eze na juda. Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na asa nime Jerusalem, bú obodo nke Jehova rọputara n'etiti ebo nile nke Israel, itiye aha-Ya n'ebe ahu. Aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon.

22. Juda we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; ha we were nmehie-ha nile nke ha mehiere kpasue Ya ekworo, kari ihe nile ndi bu nna-ha mere.

23. Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula;

24. Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

25. O rue, n'arọ nke-ise nke eze Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem:

26. o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.

27. Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.

28. O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ nēbu ha, we bughachi ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.

29. Ma okwu Rehoboam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

30. Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.

31. Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 14