Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 13:25-34 Bible Nso (IGBOB)

25. Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya.

26. Onye-amuma ahu nke mere ka o si n'uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya.

27. O we gwa umu-ya okwu, si, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwa ya.

28. O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu.

29. Onye-amuma ahu we bulie ozu onye nke Chineke ahu, dọba ya n'elu inyinya-ibu ahu, bughachi ya: ọ biarue obodo onye-amuma ahu, bú agadi, iti aka n'obi, na ilì ya.

30. Ọ dọba ozu-ya n'ílì-ya; ha we tiere ya aka n'obi, si, Ewó, nwa-nnem!

31. O rue, mb͕e o lìsiri ya na ọ gwara umu-ya okwu, si, Mb͕e m'nwuru, lì-kwa-num n'ílì nke elìri onye nke Chineke; dọba ọkpukpum n'akuku ọkpukpu-ya.

32. N'ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n'okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n'obodo nile nke Sameria.

33. Mb͕e ihe a gasiri, Jeroboam esighi n'uzọ ọjọ ya laghachi, ma o me-kwa-ra ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ọzọ site n'ọnu-ọgugu nile nke ndi Israel: onye ihe-ya nātọ ya utọ, o mejue ya aka, o we ghọ otù nime ndi-nchu-àjà nke ebe di elu.

34. Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n'elu uwa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 13