Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 13:20-31 Bible Nso (IGBOB)

20. O rue, mb͕e ha abua nānọdu nēri ihe na table, na okwu Jehova ruru onye-amuma ahu nti, bú onye mere ka ọ laghachi:

21. ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i nupuwo isi n'okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n'iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu,

22. i we laghachi, rie nri, ṅua miri, n'ebe nke Ọ gwara gi okwu, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri; ozu-gi agaghi-abiaru ílì nna-gi-hà.

23. O rue, mb͕e o risiri nri, mb͕e ọ ṅusi-kwa-ra ihe-ọṅuṅu, na o were inyinya-ibu jikwara ya, bú onye-amuma ahu nke o mere ka ọ laghachi.

24. Ọ we la, ọdum we huta ya n'uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n'uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n'akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n'akuku ozu ahu.

25. Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya.

26. Onye-amuma ahu nke mere ka o si n'uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya.

27. O we gwa umu-ya okwu, si, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwa ya.

28. O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu.

29. Onye-amuma ahu we bulie ozu onye nke Chineke ahu, dọba ya n'elu inyinya-ibu ahu, bughachi ya: ọ biarue obodo onye-amuma ahu, bú agadi, iti aka n'obi, na ilì ya.

30. Ọ dọba ozu-ya n'ílì-ya; ha we tiere ya aka n'obi, si, Ewó, nwa-nnem!

31. O rue, mb͕e o lìsiri ya na ọ gwara umu-ya okwu, si, Mb͕e m'nwuru, lì-kwa-num n'ílì nke elìri onye nke Chineke; dọba ọkpukpum n'akuku ọkpukpu-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 13