Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 12:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Jeroboam na ndi Israel nile we biakute Rehoboam n'ubọchi nke-atọ, dika eze kwuru, si, Laghachikutem n'ubọchi nke-atọ.

13. Eze we za ndi ahu okwu ike, rapu idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya;

14. o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.

15. Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.

16. Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha.

17. Ma umu Israel ndi bi n'obodo nile nke Juda, Rehoboam we buru eze-ha.

18. Eze, bú Rehoboam, we ziga Adoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; Israel nile we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ub͕ọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.

19. Israel we jehie megide ulo Devid, rue ta.

20. O rue, mb͕e Israel nile nuru na Jeroboam alatawo, ha we zìe kpọ ya ibia na nzukọ-ha, ha we me ya eze Israel nile: ọ dighi ebo ọ bula soro ulo Devid, ma-ọbughi ebo Juda, nání ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 12