Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 12:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru, ime ya eze.

2. O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nānọ n'Ijipt rue mb͕e ahu, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga, Jeroboam we biri n'Ijipt,

3. ha we ziga, kpọ ya;) na Jeroboam na nkpọkọta Israel nile biara, we gwa Rehoboam okwu, si,

4. Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a gi onwe-gi me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.

5. Ọ si ha, Lanu rue ubọchi atọ ọzọ, laghachikutekwam. Ndi Israel we la.

6. Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon, bú nna-ya, mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?

7. Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.

8. Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya.

9. Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?

10. Umu-okorọbia ndi ya na ha tokọzuru okè we gwa ya okwu, si, Otú a ka i gāsi ndi nka, ndi gwara gi okwu, si, Nna-gi mere yoke-ayi ka ọ di arọ́, ma gi onwe-gi me ka ọ di ayi nfe kari; otú a ka i gāgwa ha, si, Nkpisi-aka nke-ntà nkem di okpotokpo kari úkwù nnam.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 12