Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 11:6-23 Bible Nso (IGBOB)

6. Solomon we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, o jesozughi kwa Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.

7. Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n'ugwu nke di n'iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon.

8. Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà.

9. Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,

10. Onye nye-kwa-ra ya iwu bayere ihe a, ka ọ ghara ijeso chi ọzọ: ma o debeghi ihe ahu nke Jehova nyere n'iwu.

11. Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi.

12. Ọ bu nání na ọ bughi n'ubọchi-gi ka M'gēme ya, n'ihi Devid, bú nna-gi: ọ bu n'aka nwa-gi ka M'gādọwapu ya.

13. Otú ọ di, ọ bughi ala-eze-gi nile ka M'gādọwapu; otù ebo ka M'gēnye nwa-gi, n'ihi Devid, bú orùm, na n'ihi Jerusalem, nke M'rọputaworo.

14. Jehova we me ka onye-nmegide biliere Solomon, bú Hedad, onye Edom: na nkpuru eze n'Edom ka o sitere.

15. O rue, mb͕e Devid nọ n'Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n'Edom;

16. (n'ihi na ọnwa isi ka Joab na Israel nile nọduru n'ebe ahu, rue mb͕e o bipusiri nwoke ọ bula n'Edom;)

17. Hedad we b͕alaga, ya onwe-ya na ndikom Edom ufọdu n'etiti ndi-orù nna-ya tiyere ya, ibà n'Ijipt; ma Hedad bu nwa-okoro ntà.

18. Ha we si na Midian bilie, biarue Peran: ha we si na Peran chiri ndikom tiyere onwe-ha, bata n'Ijipt, biakute Fero, bú eze Ijipt; o we nye ya ulo, si ka enye ya nri, o nye-kwa-ra ya ala.

19. Hedad we huta amara n'iru Fero nke-uku, o we nye ya nwa-nne nwunye-ya na nwunye, bú nwa-nne Tahpenes nwunye eze.

20. Nwa-nne Tahpenes we muara ya Genubat, bú nwa-ya nwoke, onye Tahpenes mere ka ọ rapu ara n'etiti ulo Fero: Genubat we nọ n'ulo Fero n'etiti umu-ndikom Fero.

21. Ma Hedad nuru n'Ijipt na Devid soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, anwuwo kwa, Hedad we si Fero, Zilagam, ka m'we la n'alam.

22. Fero we si ya, Ma gini nākọ gi onwe-gi n'ebe m'nọ, na, le, i nācho ila n'ala-gi? Ọ si, Ọ dighi ihe kọrọm: otú ọ di, zilagam nọ̄.

23. Chineke we me ka onye-nmegide ọzọ biliere ya, bú Rezon nwa Eliada, onye b͕anariri Hedadeza eze Zoba, bú onye-nwe-ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 11