Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 11:2-10 Bible Nso (IGBOB)

2. bú ndi sitere na mba ndi Jehova siri umu Israel, Unu abala n'etiti ha, ndi ahu aba-kwa-la n'etiti unu: n'ezie ha gēwezuga obi-unu ka o so chi nile ha: ndi ahu ka Solomon rapara n'ihu-n'anya.

3. O we nwe nnù ndinyom na ọgu iri-na-ise, bú umu ndi-isi, na ọgu ndi-iko-nwayi iri-na-ise: ndinyom-ya we wezuga obi-ya.

4. O rue, na mb͕e agadi Solomon, na ndinyom-ya wezugara obi-ya ka o so chi ọzọ: obi-ya ezughi kwa okè n'ebe Jehova, bú Chineke-ya, nọ, dika obi Devid, bú nna-ya.

5. Solomon we jeso Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, jeso kwa Milkom, bú ihe-árú ndi Amon.

6. Solomon we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, o jesozughi kwa Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.

7. Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n'ugwu nke di n'iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon.

8. Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà.

9. Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,

10. Onye nye-kwa-ra ya iwu bayere ihe a, ka ọ ghara ijeso chi ọzọ: ma o debeghi ihe ahu nke Jehova nyere n'iwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 11