Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ndi-Eze 1:41-50 Bible Nso (IGBOB)

41. Adonaija na ndi nile akpọrọ, bú ndi ya na ha nọ, we nu ya mb͕e ha onwe-ha risiri ihe. Joab we nu olu opì-ike ahu, si, Gini mere olu a nke obodo nāb͕a aghara?

42. Mb͕e ọ nọ nēkwu okwu, le, Jonatan nwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, biara: Adonaija we si, Bata; n'ihi na nwoke bu dìnkpà ka i bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka i nēzì.

43. Jonatan we za, si Adonaija, N'ezie onye-nwe-ayi, bú eze Devid, emewo Solomon eze:

44. eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere:

45. Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n'ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo,

46. Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n'oche-eze nke ala-eze.

47. Ọzọ kwa, ndi-orù eze biara igọzi onye-nwe-ayi, bú eze Devid, si, Chineke-gi me ka aha Solomon di nma kari aha-gi, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze-gi: eze we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.

48. Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya.

49. Ndi nile akpọrọ akpọ ndi Adonaija nwere we ma jijiji, bilie, je, nwoke ọ bula n'uzọ-ya.

50. Ma Adonaija turu egwu n'ihi Solomon; o we bilie, je, jide mpi ebe-ichu-àjà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ndi-Eze 1