Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 9:32-44 Bible Nso (IGBOB)

32. Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike.

33. Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu.

34. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem.

35. Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:

36. na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab;

37. na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot.

38. Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.

39. Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

40. Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.

41. Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tahrea, na Ehaz.

42. Ehaz we mua Jara; Jara mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza;

43. Moza mua Binea; Refaia bu kwa nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:

44. Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan: ndia bu umu-ndikom Azel.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 9