Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 9:28-39 Bible Nso (IGBOB)

28. Ufọdu nime ha bu kwa ndi-isi ihe òfùfè; n'ihi na n'ọnu-ọgugu ka ha nāchibata ha, n'ọnu-ọgugu kwa ka ha nāchipu ha.

29. Ufọdu nime ha kwa ka agutara ibu ndi-isi ihe, bú ibu ndi-isi ihe nile nke ebe nsọ ahu, na ibu ndi-isi utu ọka flour, na manya-vine, na manu, na frankincense, na uda di iche iche.

30. Ufọdu nime umu ndi-nchu-àjà nāsugwa kwa manu-otite nēsì ísì utọ nke uda di iche iche.

31. Matitaia kwa, otù onye nime ndi Livai, onye ahu bu ọkpara Shalum onye Kora, ọ nọ n'ọnọdu ndi kwesiri ntukwasi-obi ibu onye-isi nke ihe esiri n'ite isi ihe.

32. Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike.

33. Ndia kwa bu ndi-ọbù-abù, ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai, ndi bi n'ime-ulo, ndi puru n'òfùfè ọzọ: n'ihi na ehihie na abali ha bu ndi-isi-ha n'ije-ozi ahu.

34. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem.

35. Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:

36. na nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nea, na Nedab;

37. na Gedoa, na Ahio, na Zekaraia, na Miklot.

38. Miklot we mua Shimeam. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.

39. Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 9