10. Ndi sitere na ndi-nchu-aja; Jedaia, na Jehoiarib, na Jakin;
11. na Azaraia nwa Hilkaia, nwa Meshulam, nwa Zedok, nwa Meraiot, nwa Ahaitub, bú onye-ndú ulo Chineke;
12. na Adaia nwa Jeroham, nwa Pashhua, nwa Malkija, na Maasai nwa Adiel, nwa Jahzera, nwa Meshulam, nwa Meshilemit, nwa Imea;
13. na umu-nne-ha, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha nwere, nnù madu anọ na ọgu asatọ; ndi-dike ndi bu dìnkpà ije ozi òfùfè ulo Chineke.
14. Ndi sitere na ndi Livai; Shemaia nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaia, site n'umu Merari;
15. na Bakbaka, na Heresh, na Galal, na Matanaia nwa Maika, nwa Zikri, nwa Esaf;
16. na Obadaia nwa Shemaia, nwa Galal, nwa Jedutun, na Berekaia nwa Esa, nwa Elkena, onye bi n'obodo ntà ndi Netofa.