28. Ihe-onwunwe nile ha na ebe-obibi nile ha bu Bet-el na umu-obodo-ya, na n'akuku ọwuwa-anyanwu Naaran, na n'akuku Ọdida-anyanwu Gezea na umu-obodo-ya; na Shekem na umu-obodo-ya, rue Aza na umu-obodo-ya:
29. na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.
30. Umu-ndikom Asha; Imna, na Ishva, na Ishvi, na Beria, na Sera, bú nwa-nne-ha nwayi.
31. Umu-ndikom Beria kwa; Heba, na Malkiel, onye ahu bu nna Biazait.
32. Heba we mua Jaflet, na Shoma, na Hotam, na Shua nwa-nne-ha nwayi.
33. Umu-ndikom Jaflet kwa; Pasak, na Bimhal, na Ashvat. Ndia bu umu Jaflet.
34. Umu-ndikom Shema kwa; Ahi, na Rohga, na Jehuba, na Eram.
35. Umu-ndikom Helem nwa-nne-ya kwa; Zofa, na Imna, na Shelesh, na Amal.