Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 7:23-29 Bible Nso (IGBOB)

23. O we bakuru nwunye-ya, o we turu ime, mua nwa-nwoke, nna-ya we kpọ aha-ya Beria, n'ihi na ulo-ya di n'ọnọdu ọjọ.

24. Nwa-ya nwayi bu Sheera, onye wuru Bet-horon di n'okpuru, na nke di n'elu, na Uzen-sheera.

25. Refa bu kwa nwa-ya, na Reshef, na Tela nwa-ya, na Tahan nwa-ya;

26. Ladan nwa-ya, Amaihud nwa-ya, Elishama nwa-ya;

27. Nun nwa-ya, Joshua nwa-ya.

28. Ihe-onwunwe nile ha na ebe-obibi nile ha bu Bet-el na umu-obodo-ya, na n'akuku ọwuwa-anyanwu Naaran, na n'akuku Ọdida-anyanwu Gezea na umu-obodo-ya; na Shekem na umu-obodo-ya, rue Aza na umu-obodo-ya:

29. na n'akuku umu Manase, Bet-shean na umu-obodo-ya, Teanak na umu-obodo-ya, na Megido na umu-obodo-ya, na Doa na umu-obodo-ya. Nime ndia ka umu Josef nwa Israel biri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 7