8. Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Ahimaaz;
9. Ahimaaz mua Azaraia, Azaraia mua Johanan;
10. Johanan mua Azaraia, (ọ bu onye ahu bu onye-nchu-àjà n'ulo Solomon wuru nime Jerusalem:)
11. Azaraia mua Amaraia, Amaraia mua Ahaitub;
12. Ahaitub mua Zedok, Zedok mua Shalum;
13. Shalum mua Hilkaia, Hilkaia mua Azaraia;
14. Azaraia mua Seraia, Seraia mua Jehozadak;
15. Jehozadak we je mb͕e Jehova mere ka Juda na Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'aka Nebukadneza.
16. Umu-ndikom Livai; Giashom, na Kohat, na Merari.
17. Ma ndia bu aha umu-ndikom Giashom; Libni, na Shimai.
18. Umu-ndikom Kohat bu Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.
19. Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
20. Nke Giashom; Libni nwa-ya, Jahat nwa-ya, Zima nwa-ya;
21. Joa nwa-ya, Ido nwa-ya, Zera nwa-ya, Jeaterai nwa-ya.
22. Umu-ndikom Kohat; Aminadab nwa-ya, Kora nwa-ya, Asia nwa-ya;
23. Elkena nwa-ya, Ebiasaf nwa-ya, na Asia nwa-ya;
24. Tahat nwa-ya, Uriel nwa-ya, Uzaia nwa-ya, na Shaul nwa-ya.
25. Umu-ndikom Elkena kwa; Amasai, na Ahimot.