Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 6:56-63 Bible Nso (IGBOB)

56. ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.

57. Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile;

58. na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;

59. na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile:

60. site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.

61. Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà.

62. Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ.

63. Enyere umu Merari, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun, obodo iri na abua n'ife-nzà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 6