54. Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,
55. ha we nye ha Hebron n'ala Juda, na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya;
56. ma ha nyere Keleb nwa Jefune ọhia obodo ahu, na obodo ntà ya nile.
57. Umu Eron ka ha nye-kwa-ra obodo nb͕aba, Hebron; na Libna na ebe-ita-nri-ya nile, na Jatia, na Eshtemoa na ebe-ita-nri-ya nile;
58. na Hilen na ebe-ita-nri-ya nile, na Debia na ebe-ita-nri-ya nile;
59. na Ashan na ebe-ita-nri-ya nile, na Bet-shemesh na ebe-ita-nri-ya nile:
60. site kwa n'ebo Benjamin; Geba na ebe-ita-nri-ya nile, na Alemet na ebe-ita-nri-ya nile, na Anatot na ebe-ita-nri-ya nile. Obodo-ha nile bu obodo iri na atọ n'ab͕uru-ha nile.
61. Enye-kwa-ra umu Kohat, bú ndi fọduru, nime ab͕uru ebo ahu, nime nkera ebo ahu, bú nkera ebo Manase, obodo iri n'ife-nzà.
62. Enye-kwa-ra umu Giashom, dika ab͕uru nile ha si di, site n'ebo Isaka, site kwa n'ebo Asha, site kwa n'ebo Naftali, site kwa n'ebo Manase nime Beshan, obodo iri na atọ.