24. Tahat nwa-ya, Uriel nwa-ya, Uzaia nwa-ya, na Shaul nwa-ya.
25. Umu-ndikom Elkena kwa; Amasai, na Ahimot.
26. Ma Elkena: umu-ndikom Elkena; Zofai nwa-ya, na Nehat nwa-ya;
27. Elaiab nwa-ya, Jeroham nwa-ya, Elkena nwa-ya.
28. Umu-ndikom Samuel kwa; ọkpara-ya, bú Joel, na nke-abua, bú Abaia.
29. Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya;
30. Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya.
31. Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.
32. Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di.
33. Ndia bu kwa ndi nēguzo, ha na umu-ha ndikom. Nime umu-ndikom ndi Kohat: Himan ọbù-abù, nwa Joel, nwa Samuel;
34. nwa Elkena, nwa Jeroham, nwa Eliel, nwa Toa;
35. nwa Zuf, nwa Elkena, nwa Mahat, nwa Amasai;
36. nwa Elkena, nwa Joel, nwa Azaraia, nwa Zefanaia;
37. nwa Tahat, nwa Asia, nwa Ebiasaf, nwa Kora;
38. nwa Izha, nwa Kohat, nwa Livai, nwa Israel.
39. Na nwa-nne-ya nwoke, bú Esaf, onye nēguzo n'aka-nri-ya, bú Esaf nwa Berekaia, nwa Shimea;
40. nwa Maikael, nwa Baaseia, nwa Malkija;
41. nwa Etni, nwa Zera, nwa Adaia;