16. Umu-ndikom Livai; Giashom, na Kohat, na Merari.
17. Ma ndia bu aha umu-ndikom Giashom; Libni, na Shimai.
18. Umu-ndikom Kohat bu Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.
19. Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
20. Nke Giashom; Libni nwa-ya, Jahat nwa-ya, Zima nwa-ya;
21. Joa nwa-ya, Ido nwa-ya, Zera nwa-ya, Jeaterai nwa-ya.
22. Umu-ndikom Kohat; Aminadab nwa-ya, Kora nwa-ya, Asia nwa-ya;
23. Elkena nwa-ya, Ebiasaf nwa-ya, na Asia nwa-ya;
24. Tahat nwa-ya, Uriel nwa-ya, Uzaia nwa-ya, na Shaul nwa-ya.
25. Umu-ndikom Elkena kwa; Amasai, na Ahimot.
26. Ma Elkena: umu-ndikom Elkena; Zofai nwa-ya, na Nehat nwa-ya;
27. Elaiab nwa-ya, Jeroham nwa-ya, Elkena nwa-ya.
28. Umu-ndikom Samuel kwa; ọkpara-ya, bú Joel, na nke-abua, bú Abaia.
29. Umu-ndikom Merari; Mahli, Libni nwa-ya, Shimai nwa-ya, Uza nwa-ya;
30. Shimea nwa-ya, Hagia nwa-ya, Asaia nwa-ya.
31. Ndia bu kwa ndi Devid guzoro dika ndi-isi akuku abua nke ndi-ọbù-abù nke ulo Jehova, site na mb͕e ib͕e Chineke zuru ike.