31. na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze.
32. Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise:
33. na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha.
34. Na Meshobab, na Jamlek, na Josha nwa Amazaia;
35. na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel;
36. na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia;
37. na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia;
38. Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu.