Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 4:21-30 Bible Nso (IGBOB)

21. Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia;

22. na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie.

23. Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n'aka eze n'ije-ozi-ya ka ha biri n'ebe ahu.

24. Umu-ndikom Simeon; Nemuel, na Jamin, na Jarib, na Zera, na Shaul:

25. Shalum nwa-ya, Mibsam nwa-ya, Mishma nwa-ya.

26. Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya.

27. Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda.

28. Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual;

29. na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad;

30. na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 4