1. Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal.
2. Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra.
3. Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi:
4. na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem.
5. Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara.
6. Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara.
7. Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan.
8. Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum.
9. Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u.
10. Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru.
11. Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton.