Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 29:2-9 Bible Nso (IGBOB)

2. Ma ewerewom ikem nile doziere ulo Chinekem ọla-edo iji me ihe ọla-edo, na ọla-ọcha iji me ihe ọla-ọcha, na ọla iji me ihe ọla, na ígwè iji me ihe ígwè, na osisi iji me ihe osisi; na nkume onyx, na nkume nhiọgide, na nkume ichọ-nma, na nke turu agwa, na nkume nile di oké ọnu-ahia, na nkume marble n'uba.

3. Ọzo kwa, n'ihi na ihe ulo Chinekem nātọm utọ, ebe m'nwere ihe nke akam, bú ọla-edo na ọla-ọcha, ewerewom ya nye ulo Chinekem, tukwasi ihe nile m'doziworo nye ulo nsọ ahu;

4. bú nnù talent ọla-edo asa na ọgu iri, nke ọla-edo Ofia, na nnù talent ọla-ọcha iri-na-asa na ọgu iri, bú nke anuchara n'ọku, iji machita mb͕idi nile nke ulo nile:

5. ọla-edo ahu bu iji me ihe ọla-edo, ọla-ọcha ahu bu kwa iji me ihe ọla-ọcha, na iji je ozi nile ọ bula n'aka ndi-ọ̀kà. Ònye kwa nēwere afọ-ofufo nye onwe-ya imejuru Jehova aka-ya ta?

6. Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha.

7. Ha we nye iji fè òfùfè ulo Chineke ọla-edo nnù talent iri-na-abua na ọgu iri, na orú nnù darie na nnù ise, na ọla-ọcha orú nnù talent na nnù ise, na ọla orú nnù uzọ abua na nnù ise, na ígwè orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri.

8. Ndi achọtara nkume di oké ọnu-ahia n'aka-ha we nye ha itiye n'ulo-àkù nke ulo Jehova, n'aka Jehiel onye Giashon.

9. Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n'ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n'ihi na n'obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 29