Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 29:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n'ihi na n'ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n'aka-Gi bia ka ayi nyere Gi.

15. N'ihi na ndi-ọbìa ka ayi bu n'iru Gi, na ndi-nnọdu, dika nna-ayi-hà nile: ubọchi nile ayi n'elu uwa di ka onyinyo, olile-anya adighi kwa.

16. Jehova, bú Chineke-ayi, ọtutu ihe nile a nke ayi doziworo iwuru Gi ulo n'ihi aha nsọ Gi, n'aka-Gi ka o siri bia, ọ bu kwa Gi nwe ya nile.

17. Chinekem, ama-kwa-ram na Gi onwe-gi nānwaputa obi, izi-ezi nātọ kwa Gi utọ. Mu onwem, n'izi-ezi obim ka m'were afọ-ofufo nye Gi ihe nile ndia: ma ub͕u a ndi-gi, ndi ahutara n'ebe a, ewerewom ọṅù hu ha ka ha nēwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ha.

18. Jehova, Chineke nke Abraham na Aisak na Israel, bú nna-ayi-hà, debe nka nime nchèputa nke èchìchè nile nke obi ndi-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, me kwa ka obi-ha guzosie ike n'ebe I nọ:

19. nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.

20. Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze.

21. Ha we chuara Jehova àjà, sure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku, n'echi ubọchi ahu, bú nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù ebulu abua na ọgu iri, na nnù umu-aturu abua na ọgu iri, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, ọbuná àjà n'uba bayere Israel nile;

22. ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.

23. Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.

24. Ndi-isi nile, na ndi-dike, na umu-ndikom nile kwa nke eze, bú Devid, kweye-kwa-ra inọ n'okpuru Solomon, bú eze.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 29