Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.