3. na Ilam, bú nke-ise, na Jehohanam, bú nke-isi, na Eliehoenai, bú nke-asa.
4. Obed-edom nwe-kwa-ra umu-ndikom, Shemaia, bú ọkpara, na Jehozabad, bú nke-abua, na Joa, bú nke-atọ, na Saka, bú nke-anọ, na Netanel, bú nke-ise;
5. na Amiel, bú nke-isi, na Isaka, bú nke-asa, na Peuletai, bú nke-asatọ: n'ihi na Chineke gọziri ya.
6. Amu-kwa-ra umu-ndikom nye Shemaia nwa-ya, ndi nāchi ulo nna-ha: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha bu.
7. Umu-ndikom Shemaia; Ọtni, na Refael, na Obed, na Elzabad, umu-nne-ya bu ndi-dìnkpà, Elaihu, na Semakaia.
8. Ndia nile sitere n'umu Obed-edom: ha onwe-ha na umu-ha ndikom na umu-nne-ha, ndikom bu dìnkpà n'ike ifè òfùfè; ọgu ndikom atọ na abua nke Obed-edom nwere.
9. Meshelemaia nwe-kwa-ra umu-ndikom na umu-nne, ndi-dìnkpà, iri na asatọ.
10. Hosa, onye sitere n'umu Merari, nwe-kwa-ra umu-ndikom; Shimri bú onye-isi, (n'ihi na ọ bu ezie na ọ bughi ọkpara, ma nna-ya mere ya onye-isi;)
11. na Hilkaia, bú nke-abua, na Tebalia, bú nke-atọ, na Zekaraia, bú nke-anọ: umu-ndikom na umu-nne nile nke Hosa nwere di iri na atọ.