29. Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel.
30. Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.
31. Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.