26. Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno.
27. Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri.
28. Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom.
29. Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel.
30. Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.