Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 24:16-31 Bible Nso (IGBOB)

16. nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel;

17. nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul;

18. nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia.

19. Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n'ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n'aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu.

20. Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia.

21. Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia.

22. Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.

23. Umu-ndikom Hebron kwa; Jeria, bú onye-isi, na Amaraia, bú nke-abua, na Jehaziel, bú nke-atọ, na Jekameam, bú nke-anọ.

24. Umu-ndikom Uziel, Maika; nke umu-ndikom Maika, Shamia.

25. Nwa-nne Maika, Ishia: nke umu-ndikom Ishia, Zekaraia.

26. Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi: umu-ndikom Jaazia; Beno.

27. Umu-ndikom Merari; nke Jaazia, Beno, na Shoham, na Zakua, na Ibri.

28. Nke Mahli; Eleeza, onye nēnweghi umu-ndikom.

29. Nke Kish; umu-ndikom Kish, Jerahmeel.

30. Umu-ndikom Mushi kwa; Mahli, na Ida, na Jerimot. Ndia bu umu ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.

31. Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ 1. Ihe Emere 24