13. nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab;
14. nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;
15. nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez;
16. nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel;
17. nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul;
18. nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia.
19. Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n'ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n'aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu.
20. Ma nke umu Livai ndi fọduru: nke umu Amram, Shubael; nke umu Shubael, Jehdeia.
21. Nke Rehabia: nke umu Rehabia, onye-isi bu Ishia.
22. Nke ndi Izha, Shelomot; nke umu Shelomot, Jahat.